Lamentations 4

1Lee ka ọlaedo si chuo echu.
Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma.
Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ
ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.

2Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa,
ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
si dịrị ugbu a dịka ite aja
nke ọkpụ ite kpụrụ.

3Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha
azụ ụmụ ha,
ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere;
ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.

4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya
nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri,
ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.

5Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche
tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ.
Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie
nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.

6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu
karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.
Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.
Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.

7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,
ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.
Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;
ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.

8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.
A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.
Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;
ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.

9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma
karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ,
ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ
nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.

10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere
ji gbuo ụmụ ha, sie ha.
Ụmụ ha ghọọrọ ha nri
nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.

11 Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè;
ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ.
O sunyela ọkụ na Zayọn,
nke rechapụrụ ntọala ya niile.

12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị;
otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị
na ndị iro nwere ike
si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.

13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya,
na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya,
ndị wụsiri ọbara
ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.

14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile,
dịka ndị kpuru ìsì.
Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha.
O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.

15Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!
Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!”
Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị,
ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha,
“O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”

16 Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha.
Ọ gaghị agụnyekwa ha.
Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja,
ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.

17Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,
ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka.
Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya
maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.

18Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere,
nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị.
Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị,
tupu ọgwụgwụ anyị eruo.

19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike
karịa ugo na-efe na mbara eluigwe.
Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile,
nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.

20Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ,
ka ha jidere nʼọnya ha.
Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya,
nʼetiti mba dị iche iche.

21Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm,
onye nke bi nʼala Uz.
Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ.
Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.

22Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala;
Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ.
Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm,
kpugheekwa ajọ omume gị niile.
Copyright information for IboBIU